Native Bible

Psalms 37:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume.

Psalms 37:17 in English

Psalms 37:17 · Berean Standard Bible

For the arms of the wicked will be broken, but the LORD upholds the righteous.

Context

15Ma ha ga-ewere mma agha ha gbuo onwe ha, kụrisiekwa ụta ha. 16Ihe ntakịrị nke onye ezi omume nwere dị mma karịa akụnụba ọtụtụ ndị ajọ omume; 17nʼihi na a ga-etiji ike niile nke ndị ajọ omume, ma Onyenwe anyị ga-akwagide ndị ezi omume. 18Ndị na-enweghị ịta ụta na-ebi ndụ ha nʼokpuru nlekọta Onyenwe anyị, ihe nketa ha ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 19Nʼoge ihe ndakwasị, ha agaghị akpọnwụ; ha ga-erijukwa afọ nʼụbọchị ụnwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.