Abụ Ọma 35:3
Psalms 35:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị; bịa zute ndị na-achụ m ọsọ. Gwa mkpụrụobi m, “Abụ m nzọpụta gị.”
Psalms 35:3 in English
Psalms 35:3 · Berean Standard Bible
Draw the spear and javelin * against my pursuers; say to my soul: “I am your salvation.”
Context
1O Onyenwe anyị, lụso ha ọgụ bụ ndị na-alụso m ọgụ;
buso ha agha bụ ndị na-ebuso m agha. 2Yikwasị uwe agha gị, werekwa ọta gị;
bilie bịa nyere m aka. 3Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị;
bịa zute ndị na-achụ m ọsọ.
Gwa mkpụrụobi m,
“Abụ m nzọpụta gị.” 4Mee ka ihere mee
ndị niile na-agbalịsị ike igbu m.
Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ,
na ndị ihere mere. 5Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe,
ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.