Abụ Ọma 35:5
Psalms 35:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe, ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha.
Psalms 35:5 in English
Psalms 35:5 · Berean Standard Bible
May they be like chaff in the wind, as the angel of the LORD drives them away.
Context
3Sepụta ùbe gị na anyụike agha gị;
bịa zute ndị na-achụ m ọsọ.
Gwa mkpụrụobi m,
“Abụ m nzọpụta gị.” 4Mee ka ihere mee
ndị niile na-agbalịsị ike igbu m.
Ka ndị na-agba izuzu igbu m bụrụkwa ndị a chụghachiri azụ,
na ndị ihere mere. 5Ka ha dịka igbugbo ọka mgbe oke ifufe na-efe,
ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụfu ha. 6Mee ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, bụrụkwa ebe na-amị amị;
ka mmụọ ozi Onyenwe anyị bụrụ onye na-achụ ha ọsọ. 7Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ha,
ma ha siere m ọnya, gwukwaara m olulu nʼụzọ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.