Abụ Ọma 30:5
Psalms 30:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.
Psalms 30:5 in English
Psalms 30:5 · Berean Standard Bible
For His anger is fleeting, but His favor lasts a lifetime. Weeping may stay the night, but joy comes in the morning.
Context
3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m,
i mere ka m dịrị ndụ. 4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya,
toonu aha nsọ ya. 5Iwe ya adịghị adịgide tee anya,
ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi!
Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile,
ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. 6Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m,
“Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.” 7O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma,
i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu;
ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ,
adara m mba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.