Native Bible

Psalms 30:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.

Psalms 30:5 in English

Psalms 30:5 · Berean Standard Bible

For His anger is fleeting, but His favor lasts a lifetime. Weeping may stay the night, but joy comes in the morning.

Context

3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. 4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. 5Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. 6Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.” 7O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma, i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, adara m mba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.