Native Bible

Psalms 30:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ.

Psalms 30:3 in English

Psalms 30:3 · Berean Standard Bible

O LORD, You pulled me up from Sheol; You spared me from descending into the Pit.

Context

1Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. 2O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m. 3O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. 4Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. 5Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.