Abụ Ọma 25:9
Psalms 25:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya.
Psalms 25:9 in English
Psalms 25:9 · Berean Standard Bible
He guides the humble in what is right and teaches them His way.
Context
7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m,
ya na nnupu isi m niile.
Kama site nʼịhụnanya gị cheta m,
Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ;
ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi,
na-ezikwa ha ụzọ nke ya. 10Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi,
nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya. 11Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị,
gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.