Abụ Ọma 25:8
Psalms 25:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.
Psalms 25:8 in English
Psalms 25:8 · Berean Standard Bible
Good and upright is the LORD; therefore He shows sinners the way.
Context
6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị,
nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. 7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m,
ya na nnupu isi m niile.
Kama site nʼịhụnanya gị cheta m,
Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. 8Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ;
ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. 9Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi,
na-ezikwa ha ụzọ nke ya. 10Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi,
nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.