Abụ Ọma 19:11
Psalms 19:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.
Psalms 19:11 in English
Psalms 19:11 · Berean Standard Bible
By them indeed Your servant is warned; in keeping them is great reward.
Context
9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha,
ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike,
ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo,
karịa ọlaedo a nụchara anụcha;
ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,
karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ. 11Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị;
ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha. 12Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile?
Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m. 13Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị.
Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m.
Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke,
onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.