Abụ Ọma 19:10
Psalms 19:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
Psalms 19:10 in English
Psalms 19:10 · Berean Standard Bible
They are more precious than gold, than much pure gold; they are sweeter than honey, than honey from the comb.
Context
8Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,
ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ.
Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,
ọ na-enye anya ìhè. 9Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha,
ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike,
ha niile bụkwa ihe ziri ezi. 10Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo,
karịa ọlaedo a nụchara anụcha;
ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,
karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ. 11Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị;
ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha. 12Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile?
Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.