Native Bible

Psalms 18:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.

Psalms 18:44 in English

Psalms 18:44 · Berean Standard Bible

When they hear me, they obey me; foreigners cower before me.

Context

42Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ. 43Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba; ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi. 44Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m. 45Obi na-ada ha mba; ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta. 46Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.