Abụ Ọma 18:42
Psalms 18:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
Psalms 18:42 in English
Psalms 18:42 · Berean Standard Bible
I ground them as dust in the face of the wind; I trampled them * like mud in the streets.
Context
40I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.
Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị. 41Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha. 42Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;
a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ. 43Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ
ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba;
ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi. 44Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,
ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.