Abụ Ọma 18:40
Psalms 18:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ. Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.
Psalms 18:40 in English
Psalms 18:40 · Berean Standard Bible
You have made my enemies retreat before me; I put an end to those who hated me.
Context
38Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.
Ha dara nʼokpuru ụkwụ m. 39Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,
i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. 40I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.
Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị. 41Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha. 42Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;
a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.