Abụ Ọma 18:39
Psalms 18:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha, i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
Psalms 18:39 in English
Psalms 18:39 · Berean Standard Bible
You have armed me with strength for battle; You have subdued my foes beneath me.
Context
37Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha;
alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi. 38Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.
Ha dara nʼokpuru ụkwụ m. 39Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,
i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. 40I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.
Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị. 41Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.
Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.