Native Bible

Psalms 147:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.

Psalms 147:9 in English

Psalms 147:9 · Berean Standard Bible

He provides food for the animals, and for the young ravens when they call.

Context

7Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu. 8Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile. 9Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri. 10Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ. 11Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.