Abụ Ọma 147:11
Psalms 147:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
Psalms 147:11 in English
Psalms 147:11 · Berean Standard Bible
The LORD is pleased with those who fear Him, who hope in His loving devotion.
Context
9Ọ na-enye ehi niile nri
na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri. 10Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya,
maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ. 11Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ. 12O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma;
o Zayọn, too Chineke gị. 13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike,
na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.