Abụ Ọma 147:8
Psalms 147:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
Psalms 147:8 in English
Psalms 147:8 · Berean Standard Bible
who covers the sky with clouds, who prepares rain for the earth, who makes grass to grow on the hills.
Context
6Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume
ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala. 7Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ;
jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu. 8Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe;
ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo
na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile. 9Ọ na-enye ehi niile nri
na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri. 10Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya,
maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.