Abụ Ọma 145:14
Psalms 145:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.
Psalms 145:14 in English
Psalms 145:14 · Berean Standard Bible
The LORD upholds all who fall and lifts up all who are bowed down.
Context
12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche
na ebube nke ịdị mma alaeze gị. 13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile
na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. 14Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada
na-akwagide ndị niile dara mba. 15Olileanya ihe niile dị na gị,
ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru. 16I na-asaghepụ aka gị
na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.