Abụ Ọma 142:4
Psalms 142:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee anya nʼaka nri m ma hụ na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m. Enweghị m ebe mgbaba. Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi.
Psalms 142:4 in English
Psalms 142:4 · Berean Standard Bible
Look to my right and see; no one attends to me. There is no refuge for me; no one cares for my soul.
Context
2Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya,
gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya. 3Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m,
ọ bụ gị maara ụzọ m.
Nʼụzọ ebe m na-esi aga
ka ndị mmadụ siiri m ọnya. 4Lee anya nʼaka nri m ma hụ
na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m.
Enweghị m ebe mgbaba.
Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi. 5Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị,
na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m,
oke m nʼala ndị dị ndụ.” 6Gee ntị na mkpu akwa m,
nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike;
gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ,
nʼihi na ha siri ike karịa m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.