Abụ Ọma 142:5
Psalms 142:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị, na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m, oke m nʼala ndị dị ndụ.”
Psalms 142:5 in English
Psalms 142:5 · Berean Standard Bible
I cry to You, O LORD: “You are my refuge, my portion in the land of the living.”
Context
3Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m,
ọ bụ gị maara ụzọ m.
Nʼụzọ ebe m na-esi aga
ka ndị mmadụ siiri m ọnya. 4Lee anya nʼaka nri m ma hụ
na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m.
Enweghị m ebe mgbaba.
Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi. 5Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị,
na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m,
oke m nʼala ndị dị ndụ.” 6Gee ntị na mkpu akwa m,
nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike;
gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ,
nʼihi na ha siri ike karịa m. 7Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ,
ka m nwee ike too aha gị.
Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu
nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.