Abụ Ọma 132:17
Psalms 132:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi* puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.
Psalms 132:17 in English
Psalms 132:17 · Berean Standard Bible
There I will make a horn grow for David; I have prepared a lamp for My anointed one.
Context
15Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya;
aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya. 16Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe,
ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ. 17“Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi* puputara Devid
ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ. 18Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe
ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”
132:17 Nʼebe a mpi na-egosi ịdị ike
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.