Native Bible

Psalms 132:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.

Psalms 132:15 in English

Psalms 132:15 · Berean Standard Bible

I will bless her with abundant provisions; I will satisfy her poor with bread.

Context

13Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya; 14“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ. 15Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya. 16Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ. 17“Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi* puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.