Abụ Ọma 132:14
Psalms 132:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.
Psalms 132:14 in English
Psalms 132:14 · Berean Standard Bible
“This is My resting place forever and ever; here I will dwell, for I have desired this home.
Context
12ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m
na ụkpụrụ niile m kuziri ha,
mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala
nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.” 13Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn,
ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya; 14“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi,
ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ. 15Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya;
aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya. 16Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe,
ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.