Abụ Ọma 128:4
Psalms 128:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.
Psalms 128:4 in English
Psalms 128:4 · Berean Standard Bible
In this way indeed shall blessing come to the man who fears the LORD.
Context
2Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị;
ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 3Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị
na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị;
ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv
gburugburu tebul gị. 4Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ
na-atụ egwu Onyenwe anyị. 5Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn
ụbọchị niile nke ndụ gị;
ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem, 6ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị.
Ka udo dịrị Izrel.*
128:6 Abụ 125:5
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.