Native Bible

Psalms 12:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?”

Psalms 12:4 in English

Psalms 12:4 · Berean Standard Bible

They say, “With our tongues we will prevail. We own our lips—who can be our master?”

Context

2O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha. 3Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi. 4Ndị na-asị, “Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?” 5“Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.” 6Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke, ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, nke a nụchara ugboro asaa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.