Abụ Ọma 12:5
Psalms 12:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.”
Psalms 12:5 in English
Psalms 12:5 · Berean Standard Bible
“For the cause of the oppressed and for the groaning of the needy, I will now arise,” says the LORD. “I will bring safety to him who yearns.”
Context
3Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ
na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi. 4Ndị na-asị,
“Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri;
egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?” 5“Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude,
aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru.
Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.” 6Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke,
ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ,
nke a nụchara ugboro asaa. 7O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo
ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.