Native Bible

Psalms 115:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.

Psalms 115:8 in English

Psalms 115:8 · Berean Standard Bible

Those who make them become like them, as do all who trust in them.

Context

6ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla; 7ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla. 8Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha. 9Ụmụ Izrel, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi ọ bụ onye inyeaka ha na ọta ha. 10Ezinaụlọ Erọn, tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Ọ bụ ya bụ onye inyeaka ha na ọta ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.