Abụ Ọma 115:3
Psalms 115:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
Psalms 115:3 in English
Psalms 115:3 · Berean Standard Bible
Our God is in heaven; He does as He pleases.
Context
1Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị,
kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị,
nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị. 2Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị,
“Olee ebe Chineke ha nọ?” 3Chineke anyị bi nʼeluigwe.
Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme. 4Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha,
ha bụ ọrụ aka mmadụ. 5Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu,
ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.