Native Bible

Psalms 111:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko.

Psalms 111:4 in English

Psalms 111:4 · Berean Standard Bible

He has caused His wonders to be remembered; the LORD is gracious and compassionate.

Context

2Ọrụ niile Onyenwe anyị na-arụ dị ukwuu; ndị niile na-enwe mmasị na ha na-atụgharị uche nʼime ha. 3Ọrụ ya jupụtara nʼebube na ịma mma, ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 4O meela ka e cheta ọrụ ebube ya niile; Onyenwe anyị bụ onye amara na onye ọmịiko. 5Ọ na-egboro ndị na-atụ egwu ya mkpa ihe oriri; ọ na-echetakwa ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 6O gosila ndị ya ike nke ọrụ ya niile, site nʼinye ha ala niile nke ndị mba ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.