Abụ Ọma 109:4
Psalms 109:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo ma abụ m nwoke onye ekpere.
Psalms 109:4 in English
Psalms 109:4 · Berean Standard Bible
In return for my love they accuse me, but I am a man of prayer.
Context
2nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ
emegheela ọnụ ha megide m;
ha aghaala ụgha megide m. 3Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu;
na-ebuso m agha nʼefu. 4Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo
ma abụ m nwoke onye ekpere. 5Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere,
ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya. 6Họpụta otu onye ajọ omume ka o guzogide ya;
ka onye na-ebo ebubo ụgha guzokwa nʼaka nri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.