Native Bible

Psalms 109:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu; na-ebuso m agha nʼefu.

Psalms 109:3 in English

Psalms 109:3 · Berean Standard Bible

They surround me with hateful words and attack me without cause.

Context

1O Chineke, onye m na-eto, anọgidekwala na-agba nkịtị, 2nʼihi na ndị ajọ omume na ndị aghụghọ emegheela ọnụ ha megide m; ha aghaala ụgha megide m. 3Ha na-eji okwu ịkpọ asị gbaa m gburugburu; na-ebuso m agha nʼefu. 4Nʼọnọdụ ịhụnanya m hụrụ ha, ha na-ebo m ebubo ma abụ m nwoke onye ekpere. 5Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma m mere, ịkpọ asị nʼọnọdụ ịhụnanya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.