Abụ Ọma 109:23
Psalms 109:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m efu* dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara; adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ.
Psalms 109:23 in English
Psalms 109:23 · Berean Standard Bible
I am fading away like a lengthening shadow; I am shaken off like a locust.
Context
21Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị
nyere m aka nʼihi aha gị,
site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m. 22Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa,
obi m tiwakwara etiwa nʼime m. 23Ana m efu* dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara;
adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ. 24Ike agwụla ikpere m, nʼihi ibu ọnụ;
ataakwala m ahụ, bụrụ naanị ọkpụkpụ. 25Aghọọla m onye e ji eme ihe ọchị nye ndị na-ebo m ebubo,
mgbe ha hụrụ m, ha na-efufe isi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.