Abụ Ọma 109:20
Psalms 109:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata, bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.
Psalms 109:20 in English
Psalms 109:20 · Berean Standard Bible
May this be the LORD’s reward to my accusers, to those who speak evil against me.
Context
18O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya;
ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri,
bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ. 19Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa,
dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi. 20Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata,
bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m. 21Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị
nyere m aka nʼihi aha gị,
site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m. 22Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa,
obi m tiwakwara etiwa nʼime m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.