Native Bible

Psalms 109:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya; ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri, bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ.

Psalms 109:18 in English

Psalms 109:18 · Berean Standard Bible

The cursing that he wore like a coat, may it soak into his body like water, and into his bones like oil.

Context

16Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ. 17Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya, ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya; ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla, ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ. 18O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya; ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri, bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ. 19Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa, dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi. 20Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata, bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.