Native Bible

Psalms 109:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ.

Psalms 109:16 in English

Psalms 109:16 · Berean Standard Bible

For he never thought to show kindness, but pursued the poor and needy and brokenhearted, even to their death.

Context

14Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha, ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya. 15Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile; ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile. 16Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ. 17Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya, ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya; ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla, ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ. 18O yikwasịrị ịbụ ọnụ dịka uwe ya; ọ bara nʼime ahụ ya dịka mmiri, bakwaa nʼime ọkpụkpụ ya dịka mmanụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.