Abụ Ọma 109:15
Psalms 109:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile; ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.
Psalms 109:15 in English
Psalms 109:15 · Berean Standard Bible
May their sins always remain before the LORD, that He may cut off their memory from the earth.
Context
13Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa,
ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu. 14Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha,
ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya. 15Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile;
ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile. 16Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere,
ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa
na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ. 17Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya,
ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya;
ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla,
ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.