Native Bible

Psalms 107:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.

Psalms 107:21 in English

Psalms 107:21 · Berean Standard Bible

Let them give thanks to the LORD for His loving devotion and His wonders to the sons of men.

Context

19Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile. 20O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha; ọ napụtara ha site nʼili. 21Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ. 22Ka ha chụọ aja ekele nye ya jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile. 23Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.