Abụ Ọma 106:3
Psalms 106:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.
Psalms 106:3 in English
Psalms 106:3 · Berean Standard Bible
Blessed are those who uphold justice, who practice righteousness at all times.
Context
1Toonu Onyenwe anyị.
Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma;
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 2Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ
maọbụ kwupụta otuto ya niile? 3Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi,
ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile. 4O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma,
bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha, 5ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara,
ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị
sorokwa ihe nketa gị nye otuto.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.