Native Bible

Psalms 104:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ.

Psalms 104:7 in English

Psalms 104:7 · Berean Standard Bible

At Your rebuke the waters fled; at the sound of Your thunder they hurried away—

Context

5Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya. 6I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile. 7Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ. 8Ha sitere nʼelu ugwu niile, sọrọ gaa na ndagwurugwu, ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ. 9Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.