Native Bible

Psalms 104:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha sitere nʼelu ugwu niile, sọrọ gaa na ndagwurugwu, ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ.

Psalms 104:8 in English

Psalms 104:8 · Berean Standard Bible

the mountains rose and the valleys sank to the place You assigned for them—

Context

6I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, mmiri tokpukwara ugwu niile. 7Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ. 8Ha sitere nʼelu ugwu niile, sọrọ gaa na ndagwurugwu, ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ. 9Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ. 10Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.