Abụ Ọma 104:3
Psalms 104:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.* Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu.
Psalms 104:3 in English
Psalms 104:3 · Berean Standard Bible
laying the beams of His chambers in the waters above, making the clouds His chariot, walking on the wings of the wind.
Context
1Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.
O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu;
ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe. 2Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa;
ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu 3na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.*
Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha
na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu. 4O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi,
meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi. 5Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa;
agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.