Abụ Ọma 102:3
Psalms 102:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.
Psalms 102:3 in English
Psalms 102:3 · Berean Standard Bible
For my days vanish like smoke, and my bones burn like glowing embers.
Context
1Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị;
ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị. 2Ezonarịla m ihu gị
nʼụbọchị nsogbu m.
Gee ntị nʼekpere m,
zakwaa m ngwangwa. 3Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ;
ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ. 4Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa;
ana m echefu iri nri m. 5Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ,
enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.