Native Bible

Psalms 102:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.

Psalms 102:25 in English

Psalms 102:25 · Berean Standard Bible

In the beginning You laid the foundations of the earth, and the heavens are the work of Your hands.

Context

23O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ. 24Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 25Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 26Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga. 27Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe,* ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.