Native Bible

Psalms 102:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.

Psalms 102:22 in English

Psalms 102:22 · Berean Standard Bible

when peoples and kingdoms assemble to serve the LORD.

Context

20ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.” 21Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn; a ga-eto ya na Jerusalem, 22mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe. 23O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ. 24Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.