Native Bible

Psalms 102:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola.

Psalms 102:13 in English

Psalms 102:13 · Berean Standard Bible

You will rise up and have compassion on Zion, for it is time to show her favor— the appointed time has come.

Context

11Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa. 12Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 13Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola. 14Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere. 15Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.