Native Bible

Proverbs 4:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.

Proverbs 4:23 in English

Proverbs 4:23 · Berean Standard Bible

Guard your heart with all diligence, for from it flow springs of life.

Context

21Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị, 22nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ. 23Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile. 24Ka ụgha ọbụla ghara isi gị nʼọnụ pụta; kpọọ ịgha ụgha niile na okwu rụrụ arụ niile asị. 25Legide anya nʼihu ime ihe bụ eziokwu; atụgharịkwala isi gị ile ihe ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.