Native Bible

Proverbs 26:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.

Proverbs 26:25 in English

Proverbs 26:25 · Berean Standard Bible

When he speaks graciously, do not believe him, for seven abominations fill his heart.

Context

23Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie, ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ. 24Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha, ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya. 25Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha. 26Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya, ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya. 27Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya. Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.