Ilu 17:5
Proverbs 17:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya. Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ.
Proverbs 17:5 in English
Proverbs 17:5 · Berean Standard Bible
He who mocks the poor insults their Maker; whoever gloats over calamity will not go unpunished.
Context
3Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo
ma Onyenwe anyị na-anwale obi. 4Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie,
onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi. 5Onye ọbụla na-akwa ogbenye emo ọ bụ Chineke kere ha ka ọ na-elelị anya.
Ndị niile na-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe ike dakwasịrị ha aghaghị ịta ahụhụ. 6Ụmụ ụmụ bụ okpueze ndị okenye.
Nne na nna bụ ịnya isi nke ụmụ ha. 7Egbugbere ọnụ na-ekwu okwu dị mma abụghị nke onye nzuzu,
otu a kwa, egbugbere ọnụ na-agha ụgha ekwesighị ịbụ nke onye na-achị achị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.