Ilu 13:5
Proverbs 13:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị, ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu na-ewetara ya ihere na nkọcha.
Proverbs 13:5 in English
Proverbs 13:5 · Berean Standard Bible
The righteous hate falsehood, but the wicked bring shame and disgrace.
Context
3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!*
Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi. 4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;
ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ. 5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,
ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu
na-ewetara ya ihere na nkọcha. 6Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,
ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi. 7Ọ dị mmadụ na-eme ka ọ bụ ọgaranya maọbụ onye ụkpa.
Ma ọ dịkwa mmadụ na-eme ka ọ bụ onye ụkpa maọbụ ọgaranya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.