Ilu 13:4
Proverbs 13:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta; ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ.
Proverbs 13:4 in English
Proverbs 13:4 · Berean Standard Bible
The slacker craves yet has nothing, but the soul of the diligent is fully satisfied.
Context
2Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ,
ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha. 3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!*
Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi. 4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;
ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ. 5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,
ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu
na-ewetara ya ihere na nkọcha. 6Ezi omume mmadụ na-abara ya uru na ndụ ya niile,
ma ajọ omume ndị mmehie na-ala ha nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.