Ilu 13:3
Proverbs 13:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!* Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi.
Proverbs 13:3 in English
Proverbs 13:3 · Berean Standard Bible
He who guards his mouth protects his life, but the one who opens his lips invites his own ruin.
Context
1Nwa maara ihe na-ege ntị na ndụmọdụ nna ya
ma onye na-akwa emo adịghị ege ntị nʼịba mba. 2Onye na-eme ezi ihe ga-esite nʼokwu ọnụ ya nweta ụgwọ ọrụ,
ma ndị na-aghọgbu ibe ha ga-anata ihe ike dịka ụgwọ ọrụ ha. 3Mmadụ zuruoke bụ onye na-ejide ire ya aka!*
Ma onye ekwuruekwu na-ewetara onwe ya mbibi. 4Ndị umengwụ na-achọ ọtụtụ ihe ma ọ dịghị ihe ha na-enweta;
ma onye na-arụsị ọrụ ike na-enweta ihe niile ọ chọrọ. 5Onye ezi omume kpọrọ ụgha asị,
ma okwu ọnụ onye na-emebi iwu
na-ewetara ya ihere na nkọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.